Revelation 19:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu inyinya dị ọcha guzo nꞌebe ahụ. Onye nọkwasịrị nꞌelu ya bụ onye a kpọrọ aha ya Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ebu agha na onye na-enye ahụhụ nꞌụzọ ziri ezi.
Igbo 2006
M'we hu elu-igwe ka o gheworo oghe; ma le, inyinya ọcha di, na Onye nānọkwasi ya, bú Onye anākpọ Onye kwesiri ntukwasi-obi na Onye-ezi-okwu; ọ bu kwa n'ezi omume ka Ọ nēkpe ikpé, nēbu kwa agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha.