Revelation 19:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ kpụ mma agha dị nkọ nꞌọnụ ya, nke o ji egbutu mba nile. Ọ ga-ejikwa aka ike chịa ha. Ọ bụkwa ọrụ ya ime ka mba nile nụrụ ụfụ iwe Chineke Onye pụrụ ime ihe nile. Nꞌihi na mmeso ọ ga-emeso ha ga-adị ka a ga-asị na o ji ụkwụ ya na-azọpịasị mkpụrụ vaịnị dị na mbadamba ala ebe a na-anọ azọcha mkpụrụ vaịnị.
Igbo 2006
Mma-agha di nkọ nēsi kwa n'ọnu-Ya puta, ka O we were ya tib͕ue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n'aka nke ígwè zùa ha dika aturu: Ya onwe-ya nāzọ kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke manya nke ọnuma nke iwe Chineke Onye puru ime ihe nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.