Revelation 19:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma e jidere anụ ọhịa ọjọọ ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ nwere ike ime ihe ịtụnanya mgbe ọ bụla anụ ọhịa ọjọọ ahụ nọ nsọ. Ọrụ ịtụnanya nke o ji duhie ndị nile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị kpọrọ isi ala nye oyiyi ya. Ha abụọ, anụ ọhịa ahụ, na onye amụma ụgha ya, ka a tụnyere nꞌime ọdọ ọkụ ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye.
Igbo 2006
Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n'iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye.