Revelation 19:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị agha ha nile ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nꞌọnụ onye ahụ nọ nꞌelu inyinya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe nile nke eluigwe rikwara ozu ha dị ka ha nwere ike iri.
Igbo 2006
ewe were mma-agha nke Onye ahu nānọkwasi n'inyinya ahu, bú mma-agha ahu nke si n'ọnu-Ya puta, b͕ue ndi fọduru: nnunu nile we rijuru afọ site n'anu-aru-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị agha ha fọdụrụnụ ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nʼọnụ onye ahụ nọ nʼelu ịnyịnya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe rikwara ozu ha.