Revelation 19:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na ihe e kere eke anọ ahụ dara nꞌala nꞌihu Chineke Onye nọkwasịrị nꞌelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Ka o si otu a dịrị! Haleluya! Toonụ Onyenwe anyị!”
Igbo 2006
Orú ndi-okenye na anọ ahu na ihe anọ ahu nke di ndu we da n'ala, kpọ isi ala nye Chineke, bú Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, si, Amen; Haleluya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!”