Revelation 19:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ, anụkwara m ihe yiri ụzụ nke ọtụtụ ndị mmadụ. Nꞌezie, ụzụ a dara dị ka ụzụ nke mmadụ na-anụ mgbe ebili mmiri na-amagharị nꞌoke osimiri. Ọ dakwara dị ka ụzụ nke egbe eluigwe. Ma ihe ndị na-eme ụzụ a na-eti mkpu na-ekwu bụ, “Toonụ Onyenwe anyị. Nꞌihi na Onyenwe anyị Chineke anyị na-achị achị ugbu a.
Igbo 2006
M'we nu ihe dika olu nke oké ìgwè ndi, di kwa ka olu ọtutu miri, di kwa ka olu éb͕è-elu-igwe di ike, nāsi, Haleluya: n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke-ayi, Onye puru ime ihe nile, nābu eze.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị, “Haleluya! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị.