Revelation 19:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mmụọ ozi ahụ kwa gwara m okwu sị m dee ihe ndị a nꞌakwụkwọ: “Ngọzi na-adịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nꞌoriri ọlụlụ nwụnye Nwa atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Okwu a i deturu ugbu a bụ okwu Chineke nꞌonwe ya kwuru.”
Igbo 2006
O we sim, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi akpọworo ibia na nri-anyasi ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu. O we sim, Ndia bu okwu nke Chineke kwuru n'ezie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.”