Revelation 2:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Atụkwala egwu nꞌihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nꞌime ndị gị nꞌụlọ mkpọrọ ka o jiri ya nwaa gị. A ga-akpagbu gị abalị iri. Ma guzosie ike, ọ bụladị mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, aga m enye gị okpu nke ndụ ahụ.
Igbo 2006
Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n'etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M'gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.