Revelation 2:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Amaara m nke ọma na i bi nꞌime obodo ebe ekwensu wukwasịrị ocheeze ya. Ọ bụkwa eziokwu na ekwensu gbara ofufe gị gburugburu. Ma ị na-anọgidesị ike nꞌime m. Ị jụrụ ịgọnarị m ọ bụladị nꞌoge Antipas ohu m ahụ kwesịrị ntụkwasị obi tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi m site nꞌaka ndị na-ejere ekwensu ozi.
Igbo 2006
Amataram ebe i bi, bú ebe oche-eze Setan di: i nējidesi kwa aham ike, i gọnarighi kwa okwukwem, ọbuná n'ubọchi Antipas onye-àmàm, onye nkem kwesiri ntukwasi-obi, onye eb͕uru n'etiti unu, ebe Setan bi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma ị na-anọgidesi ike nʼaha m. Ị jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, ọ bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi.