Revelation 2:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ma e wezụga ezi ama ndị a, enwere m ihe ụfọdụ megide gị. Ị na-akwagide ụfọdụ nꞌetiti ndị m bụ ndị na-eme omume dị ka Belam, onye ziri Balak otu ọ ga-esi merụọ ụmụ Izirel site nꞌiduba ha na mmehie ịkwa iko na oriri mmemme dị iche iche a na-emere arụsị.
Igbo 2006
Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n'ihi na i nwere n'ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n'iru umu Israel ihe-ima-n'ọnyà, ka ha rie ihe achuru n'àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko.