Revelation 2:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ Kraịst. Ọ bụ nanị ndị na-emeri emeri ga-eri achịcha ahụ e zoro ezo, nke bụ ihe oriri ndị nọ nꞌeluige. Ha nile nꞌotu nꞌotu ka m ga-enye ezi nkume ọcha ahụ. A ga-edekwasị aha ọhụrụ nꞌelu nkume ahụ, nke onye ọ bụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ ga-anata ya.
Igbo 2006
Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēnye ufọdu nime manna ahu nke ezobeworo, M'gēnye kwa ya nkume ọcha, n'elu nkume ahu ka edewo-kwa-ra aha ọhu, nke ọ nādighi onye ọ bula matara ma-ọbughi onye nānata ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.