Revelation 2:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Nke a bụ ihe o kwuru. Amaara m ezi ọrụ gị nile, tinyere obi ebere i nwere nꞌebe ndị ogbenye nọ. Ahụkwara m onyinye ọma ị na-enye ha, na ije ozi ị na-ejere ha. E wezụga ihe ndị a, amaara m ịhụnanya gị, na okwukwe gị, na ntachi obi gị. Ahụkwara m ịnụ ọkụ nke obi gị, na ezi ọchịchọ dị nꞌime gị imezu ha.
Igbo 2006
Amataram ọlu-gi nile, na ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi na ije-ozi-gi na ntachi-obi-gi, mata kwa na ọlu ikpe-azu gi kariri nke-mbu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Amaara m ọrụ gị niile, na ịhụnanya gị, na okwukwe gị. Amakwaara m ije ozi gị na ntachiobi gị, na-ahụkwa na ị na-arụ ọrụ ugbu a karịa ka i mere na mbụ.