Revelation 2:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezibel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị, onye na-akụziri ndị m na mmehie ịkwa iko bụ ihe ziri ezi. Ọ na-akwagide ha ka ha na-akwa iko, na-akụzikwara ha ka ha na-eri ihe a chụrụ nꞌịta nye arụsị.
Igbo 2006
Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n'àjà nye arusi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị nye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja.