Revelation 2:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a gee ntị nꞌihe m chọrọ ikwu. Aga m etinye ya nꞌute ọrịa ebe ọ ga-anọ nꞌọrịa taa ahụhụ. Ịta ahụhụ a ga-adịkwara ya na ndị nile na-eso ụzọ ịkwa iko ya. Ọ bụrụ na ha echegharịghị site nꞌụzọ ọjọọ ha, ihe ndị a ga-abịakwasị ha.
Igbo 2006
Le, anamatubà ya n'ihe-nkpab͕u, tubà kwa ndi soro ya kwa iko nime oké nkpab͕u, ma asi na ha echègharighi n'ọlu-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha.