Revelation 2:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma nꞌebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ nile ga-amata na abụ m onye na-ahụzu echiche na ọchịchọ obi ụmụ mmadụ. Onye ọ bụla ga-anatakwa ụgwọ ọrụ kwesịrị ya.
Igbo 2006
M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.