Revelation 2:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chee echiche nke ọma banyere ịhụnanya i nwere nꞌebe m nọ na mmalite, ma laghachi azụ nꞌime ya. Malite ịrụsị ọrụ ike dị ka i mere na mmalite. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịakwute gị wepụ oriọna nọchiri anya gị nꞌebe ọ dị nꞌetiti oriọna ndị ọzọ.
Igbo 2006
Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M'gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n'ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Cheta ọnọdụ i si na ya daa. Chegharịa, mekwa ihe ndị ahụ ị na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịa wepụ ihe ịdọba oriọna gị site nʼọnọdụ ya.