Revelation 2:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ Onyenwe anyị kwesịrị ime ka ozi a baa ya nꞌime ntị. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye mkpụrụ mbụ sitere nꞌosisi ahụ na-enye ndụ, nke bụ ebe izuike nke Chineke.
Igbo 2006
Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o rie nkpuru si n'osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke.