Revelation 2:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Amaara m ụzọ nile i si taa ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị. Ọzọ kwa, amaara m ihe banyere ndọgbu i na-adọgbu onwe gị nꞌọrụ, na ọnọdụ ogbenye gị. Ma nꞌezie, i nwere akụ dị ukwuu nꞌeluigwe. Amaara m ihe banyere nkwutọ nile ndị na-emegide gị na-ekwutọ gị, nkwutọ nke ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Juu, na ụmụ Chineke, ndị na-abụghị ụmụ Chineke, kama ha bụ ndị na-akwagide ọrụ ekwensu.
Igbo 2006
Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, ị bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu.