Revelation 20:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nꞌeluigwe rịda. O ji mkpịsị igodo e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ. O jikwa mkpọrọ igwe dị arọ nꞌaka ya.
Igbo 2006
M'we hu mọ-ozi ka o nēsi n'elu-igwe ridata, nēji nkpisi-ugodi nke abyss ahu n'aka-ya, ya na oké nkpọrọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya.