Revelation 20:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, nke otu onye nọkwasịrị nꞌelu ya. Mgbe ụwa na mbara eluigwe nile hụrụ onye a nọ nꞌelu ocheeze ahụ ha gbara barịị fuo. Ma ha achọtaghị ebe ha ga-ezo onwe ha.
Igbo 2006
M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha.