Revelation 20:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ ahụrụ m ndị nwụrụ anwụ nile, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nꞌihu Chineke. E meghere akwụkwọ, megheekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nꞌihe nile e dere nꞌakwụkwọ ahụ kpee ndị a nile nwụrụ anwụ ikpe, dị ka ọrụ ha rụrụ si dị.
Igbo 2006
M'we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n'iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpe ndi nwuru anwu ikpé site n'ihe nile edereri n'akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.