Revelation 20:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Emesịa, mmụọ ozi ahụ tụnyere agwọ ochie ahụ nꞌime olulu ahụ na-enweghị nsọtụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nꞌelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba nile dị nꞌụwa ọzọ tutuu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya hapụ ya ka ọ gagharịa nwa ntịntị oge.
Igbo 2006
we tubà ya nime abyss ahu, mechie ya, kà kwa ya akàrà n'elu ya, ka o we ghara iduhie mba nile ọzọ, rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi: mb͕e arọ ndia gasiri aghaghi itọpu ya nwa oge.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge.