Revelation 20:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nꞌelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụ obi ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi ịgba ama banyere Jisọs na nꞌihi ikwusa okwu Chineke, na ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi na ha akpọghị isi ala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a tụrụ atụ, ma ọ bụ kwere ka a kaa ha akara ya nꞌegedege ihu ha, ma ọ bụ nꞌaka ha. Ha esitela nꞌọnwụ ghọọ ndị dị ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst ugbu a na-achị isi otu puku afọ.
Igbo 2006
M'we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m'we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n'ihi àmà Jisus, na n'ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ha na n'aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nʼelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụobi ndị ahụ e bepụrụ isi nʼihi na ha gbaara Jisọs akaebe, kwusakwa okwu Chineke. Ha akpọbeghị isiala nye anụ ọhịa ahụ maọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụ ọhịa ahụ nʼegedege ihu ha, maọbụ nʼaka ha. Ha dịkwa ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst chịa otu puku afọ.