Revelation 20:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nꞌọnwụ nke mbụ ahụ, nꞌihi na ụjọ ọnwụ nke ugboro abụọ adịghị atụ ha, nꞌihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa achịa puku afọ.
Igbo 2006
Ngọzi nādiri ya, ọ di kwa nsọ, bú onye nwere òkè nime nbilite-n'ọnwu mbu ahu: ọnwu nke-abua ahu enweghi ike n'ebe ndia nọ; kama ha gābu ndi-nchu-àjà nke Chineke na nke Kraist, ha gēso kwa Ya buru eze nnù arọ abua na ọgu iri ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nʼọnwụ nke mbụ ahụ. Ọnwụ nke abụọ enweghị ike nʼebe ha nọ, nʼihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa ọchịchị puku afọ.