Revelation 20:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba nile nọ nꞌakụkụ nile nke ụwa. Ọ ga-akpọkọta ha nꞌotu ebe. Gọg na Magọg ga-eso ha. Ha nile ga-ezukọ ibu agha. Ndị agha ha ga-adị nnọọ ukwuu, a pụghị ịgụta ọnụ ọgụgụ ha nꞌihi na ha ga-adị ukwuu dị ka aja dị nꞌọnụ mmiri osimiri.
Igbo 2006
ọ gāputa kwa iduhie mba nile ndi di na nkuku anọ nke uwa, bú Gog na Megog, ime ka ha zukọ ibu agha ahu: ndi ọnu-ọgugu-ha ra ka ájá nke oké osimiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri.