Revelation 20:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha nile ga-esi nꞌakụkụ nile nke ụwa zukọọ, gbaa obodo ndị Chineke gburugburu, ya bụ obodo Jerusalem ahụ Chineke hụrụ nꞌanya. Ma Chineke ga-eme ka ọkụ si nꞌeluigwe daa dakwasị ha, repịa ndị agha ahụ nile.
Igbo 2006
Ha we rigo n'obodobo uwa, nọgide ọmuma-ulo-ikwū ndi nsọ gburugburu, ya na obodo ahu nke ahuworo n'anya: ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.