Revelation 21:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbidi ya nile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ e si abanye nꞌime ya. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izirel nꞌọnụ ụzọ ama ndị a nꞌotu nꞌotu.
Igbo 2006
o nwe-kwa-ra oké mb͕idi di elu; nwe kwa ọnu-uzọ-ama iri na abua, nwe kwa ndi-mọ-ozi iri na abua n'ọnu-uzọ-ama ahu; nwe kwa aha edekwasiworo ha, nke bu aha nke ebo iri na abua nke umu Israel:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu.