Revelation 21:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihe e ji rụọ mgbidi obodo ahụ bụ nkume dị oke ọnụ ahịa a na-akpọ jaspa. Ọ bụkwa ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwụ dị ka enyo, ka e ji rụọ obodo ahụ.
Igbo 2006
Ihe eji lu mb͕idi ahu bu jasper: obodo ahu bu kwa ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nēnwu enwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe e ji rụọ mgbidi ya bụ nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa, jiri ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwu dịka enyo dị ọcha rụọ obodo ahụ.