Revelation 21:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
E ji nkume dị oke ọnụ ahịa ndị a chọọ ntọ ala mgbidi obodo ahụ mma: Ntọ ala nke mbụ, nkume a na-akpọ jaspa, ntọ ala nke abụọ nkume a na-akpọ safaia, ntọ ala nke atọ nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ nkume a na-akpọ emeralụdụ, nke ise nkume a na-akpọ sadonks,
Igbo 2006
Ewerewo nkume nile ọ bula di oké ọnu-ahia chọ ntọ-ala nke mb͕idi obodo ahu nma. Ntọ-ala mbu bu jasper; nke-abua bu sapphire; nke-atọ bu chalcedony; nke-anọ bu emerald;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E ji nkume niile dị oke ọnụahịa chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala nke mbụ, bụ nkume a na-akpọ jaspa, ntọala nke abụọ, nkume a na-akpọ safaia, ntọala nke atọ, nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ, nkume a na-akpọ emeralụdụ,