Revelation 21:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anụkwara m oke olu si nꞌocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nꞌetiti ụmụ mmadụ. Ya na ha ga-ebikwa. Ha ga-abụkwa ndị ya. Ee, nꞌezie, Chineke nꞌonwe ya ga-anọkwa nꞌetiti ha bụrụkwa Chineke ha.
Igbo 2006
M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'oche-eze ahu dà, si, Le, ūlọ-ikwū nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha.