Revelation 21:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Onye ahụ nọ nꞌocheeze ahụ gwara m okwu sị, “Lee, ana m eme ka ihe nile dị ọhụrụ. Dee ihe ndị a nꞌakwụkwọ nꞌihi na ihe m na-agwa gị ugbu a bụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.
Igbo 2006
Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n'ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”