Revelation 22:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ana m adọ onye ọ bụla nụrụ okwu amụma dị nꞌakwụkwọ a aka na ntị sị, Ọ bụrụ na onye ọ bụla atụkwasị ihe ọ bụla nꞌakwụkwọ a, Chineke ga-atụkwasịrị ya ihe otiti ahụ nile e kwuru okwu ha nꞌakwụkwọ a.
Igbo 2006
Mu onwem nāb͕ara onye ọ bula àmà, bú onye nānu okwu nile nke amuma nke akwukwọ a, si, Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n'akwukwọ a:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m adọ onye ọbụla nụrụ okwu amụma dị nʼakwụkwọ a aka na ntị, sị, ọ bụrụ na onye ọbụla atụkwasị ihe ọbụla nʼelu ha, Chineke ga-atụkwasịrị onye ahụ ihe ntaramahụhụ ahụ niile e kwuru maka ha nʼakwụkwọ a.