Revelation 22:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara m okwu sị m, “Okwu ndị a kwesịrị ka a tụkwasị ha obi. Ha bụkwa eziokwu. Onyenwe anyị Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya ịgwa gị ihe ndị ahụ ga-emezu nꞌoge na-adịghị anya.
Igbo 2006
O we sim, Okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu: Onye-nwe-ayi, bú Chineke nke ndi-mọ nke ndi-amuma, zite-kwa-ra mọ-ozi-Ya igosi ndi-orù-Ya ihe nile nāghaghi iputa na mb͕e ntà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ozi ahụ gwara m, “Okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. Onyenwe anyị, bụ Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya igosi ụmụodibo ya ihe ndị ahụ ga-emezu nʼoge na-adịghị anya.