Revelation 3:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis. Ọ bụkwa ozi a ka a na-ezi gị site nꞌaka onye ahụ nwe mmụọ asaa ahụ na kpakpando asaa ahụ. Amaara m ihe banyere ama ahụ a na-agbara gị na ị bụ nzukọ dị ezi ndụ, na nzukọ dị ike nke ukwuu, ma nꞌeziokwu ị bụ nzukọ nwụrụ anwụ.
Igbo 2006
Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis, sị ya: Ndị a bụ okwu onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke na kpakpando asaa. Amaara m ọrụ gị niile, ị nwere aha dịka onye dị ndụ ma ị bụ onye nwụrụ anwụ.