Revelation 3:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ma onye ọ bụla na-emeri emeri ka m ga-eme ka ọ bụrụ onyeisi nꞌime ụlọ nsọ Chineke m. A ga-ekpuchi ya nke ọma nꞌụzọ zuru oke. Ọ gaghị apụkwa apụ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nꞌahụ ya. Ọ ga-ebikwa nꞌime obodo nsọ Chineke m, nke bụ obodo Jerusalem ọhụrụ ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nꞌihu ya.
Igbo 2006
Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēme ka ọ buru ide n'ulo nsọ nke Chinekem, ọ gaghi-esi kwa n'ebe ahu pua ọzọ ma-ọli: M'gēde-kwasi kwa ya aha Chinekem, na aha obodo Chinekem, bú Jerusalem ọhu, nke si n'elu-igwe ridata site n'ebe Chinekem nọ, M'gēdekwasi kwa ya aha ọhu nkem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onye ọbụla na-emeri emeri, ka m ga-eme ka ọ bụrụ ogidi nʼime ụlọnsọ Chineke m. Ọ gaghị esikwa nʼebe ahụ pụọ apụọ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nʼahụ, na aha obodo nsọ Chineke, nke bụ Jerusalem ọhụrụ ahụ si nʼeluigwe, ebe Chineke nọ na-arịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nʼihu ya.