Revelation 3:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi nzukọ dị na Laodisia. Ọzi a sitere nꞌaka onye ahụ a na-apụghị iwezụga nꞌọnọdụ ya. Ọ bụkwa onye àma kwesịrị ntụkwasị obi banyere ihe nile dị ugbu a, na nke dịrị na mgbe ochie, na nke gaje ịdị ruo mgbe ebighị ebi. Ya onwe ya bụkwa onye kachasị ihe nile elu, bụrụkwa isi mmalite ihe nile Chineke kere.
Igbo 2006
Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si, Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Laodisia, sị ya: Ndị a bụ okwu Amen, onye kwesiri ntụkwasị obi, na onye bụ ezi onyeama, bụrụkwa isi mmalite ihe niile Chineke kere.