Revelation 3:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“A sị na ị maara ihe ị gaara achọsi ike ịzuta ezigbo, ọlaedo nꞌaka m. Bụ ọlaedo a nụchara anụcha nꞌime ọkụ. Mgbe ahụ ị ga-abụkwa ọgaranya nꞌezie. Ị gaara esitekwa nꞌaka zụta ezi akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ị gaara abịakwute m ka m nye gị ezi ọgwụ ga-agwọ ọrịa anya gị, ka i bido ịhụ ụzọ nke ọma.
Igbo 2006
aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ị ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. Ị gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka ị zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma.