Revelation 3:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Lee, ana m eguzo ugbu a nꞌọnụ ụzọ obi gị na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ olu m mgbe m na-akpọ oku meghepụrụ m ụzọ, aga m abata bịakwute ya, sorokwa ya nwekọọ ihe. Ya onwe ya ga-esorokwa m nwekọọ ihe.
Igbo 2006
Le, anameguzo n'ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M'gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee, ana m eguzo nʼọnụ ụzọ na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m ma meghee ụzọ, aga m abata soro ya rikọọ ihe, ya onwe ya ga-esokwa m rie ihe.