Revelation 3:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Amaara m gị nke ọma dị ka onye na-adịghị ike ma ọlị. Ma i jisịrị ike na-enye m nsọpụrụ. Ị gọnarịkwaghị aha m. Nꞌihi nke a, emegheelara m gị ụzọ nke onye ọ bụla na-apụghị imechi.
Igbo 2006
Amataram ọlu-gi nile (le, enyewom gi ọnu-uzọ nke emegheworo n'iru gi, nke onye ọ bula nāpughi imechi), na i nwere ike ntà, i debe-kwa-ra okwum, i gọnarighi kwa aham.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Amaara m ọrụ gị niile. Lee, edebela m nʼihu gị ọnụ ụzọ nke e meghere emeghe, nke onye ọbụla na-apụghị imechi. Amaara m na i nwere ike dị ntakịrị, ma i debere okwu m, ị gọnarịkwaghị aha m.