Revelation 3:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Achọrọ m ka ị mata na aga m eme ka ndị ahụ na-akwagide ụzọ ekwensu ma na-asị na ha bụ ndị dị nsọ mata na mụ onwe m họpụtara gị nye onwe m. Ha ga-abịa kpọọ isi ala nye m, kwupụta na ha aghọtala na ọ bụ gị ka m hụrụ nꞌanya.
Igbo 2006
Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M'gēme ka ha bia kpọ isi ala n'iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m eme ka ndị ahụ so na nzukọ ekwensu, bụ ndị na-asị na ha bụ ndị Juu ma ha abụghị, kama ha bụ ndị ụgha, aga m eme ka ha bịa kpọọ isiala nye gị, si otu a ghọta na ahụrụ m gị nʼanya.