Revelation 4:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m elu hụ ọnụ ụzọ eluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ụda ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa nꞌebe a ka m gosi gị ihe gaje ime nꞌoge dị nꞌihu.”
Igbo 2006
Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, ọnu-uzọ ka o gheworo oghe n'elu-igwe, olu mbu m'nu-kwa-ra, olu dika nke opì nākpayerem uka, otù onye nāsi, Rigota n'ebe a, M'gēgosi kwa gi ihe nile nke nāghaghi iputa mb͕e ihe ndia gasiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m hụ ọnụ ụzọ dị nʼeluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa, gbagota nʼebe a, ka m gosi gị ihe ga-emezuriri mgbe ihe ndị a gasịrị.”