Revelation 4:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ìhè dị ukwuu, nke na-egbu nweghenweghe dị ka mkpụrụ mmiri si nꞌahụ onye ahụ nọkwasịrị nꞌocheeze ahụ na-achapụta. Eke na egwurugwu, nke na-egbukwa amụma, gbara ocheeze ahụ gburugburu.
Igbo 2006
Onye ahu Nke nānọdu ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ buru na anēle Ya anya: eke-na-ogwurugwu di kwa oche-eze ahu gburugburu, yiri emerald ma ọ buru na anēle ya anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu.