Revelation 4:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke ọ bụla nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere nku isii. Nku dị nꞌetiti nku ndị a nwere anyị hiri nne. Ehihie nile na abalị nile ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile dị. Bụ onye ahụ dịrị nꞌoge gara aga, onye dị ugbu a, na onye ga-adị ruo mgbe nile ebighị ebi.”
Igbo 2006
Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n'otù n'otù, ha juputa-kwa-ra n'anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “ ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile dị,’ bụ onye ahụ dịkwaarị, onye ahụ na-adị, na onye ahụ na-aga ịbịa.”