Revelation 5:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ anụrụ m ka ndị nile nọ nꞌeluigwe na ndị nọ nꞌụwa na ndị nọ nꞌokpuru ụwa, na ndị nọ nꞌokpuru oke osimiri na-eti mkpu na-asị, “Ka ngọzi nile, na nsọpụrụ nile, na otuto nile, na ike nile dịrị Onye ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ahụ, ha dịkwara Nwa atụrụ ahụ ruo mgbe ebighị ebi!”
Igbo 2006
M'we nu ihe nile ọ bula ekère èkè nke di n'elu-igwe, na n'elu uwa, na n'okpuru uwa, na n'elu oké osimiri, ha na ihe nile di ha nime, ka ha nāsi, Ọ bu Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, Ya na Nwa-aturu ahu, ka ngọzi nile na nsọpuru nile na otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ ruo mgbe niile ebighị ebi!”