Revelation 5:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe m lere anya, ahụrụ m otu Nwa atụrụ ka o guzo nꞌihu iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, nꞌihu ocheeze ukwu ahụ, na nꞌihu ihe e kere eke anọ ahụ. Nwa atụrụ ahụ nwekwara apa dị iche nꞌahụ ya, bụ nke mere ka ọ nwụọ nꞌoge ọ nwụrụ. O nwekwara mpi asaa na anya asaa nke nọ ọnọdụ mmụọ asaa nke Chineke, nke a na-ezipụ ịga nꞌebe dị iche iche nꞌime ụwa.
Igbo 2006
M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ahụrụ m Nwa Atụrụ na-eguzo nʼetiti ocheeze ahụ dịka e gburu ya egbu. Anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu. O nwekwara mpi asaa na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ nʼime ụwa niile.