Revelation 5:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Nwa atụrụ ahụ naara akwụkwọ ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ndị gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu dara nꞌala nꞌihu Nwa atụrụ ahụ. Ha nile nꞌotu nꞌotu jikwa opi na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe na-esi isi ụtọ jupụtara nꞌime ha. Ihe na-esi isi ụtọ a bụkwa ekpere ndị nsọ.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n'ala n'iru Nwa-aturu ahu, ha nile n'otù n'otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ.