Revelation 5:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha bụkuru Nwa atụrụ ahụ abụ ọhụrụ na-asị, “Nanị gị kwesịrị ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara dị ya nꞌahụ. Nꞌihi na e gburu gị, ma i sitere nꞌọnwụ gị kpọtara Chineke ndị mmadụ, ndị si nꞌagbụrụ nile, na asụsụ nile, na ndị dị iche iche, na mba nile.
Igbo 2006
Ha nābù kwa abù ọhu, si, I kwesiri inata akwukwọ ahu, na isaghe akàrà-ya: n'ihi na eb͕uru Gi eb͕u, I were kwa ọbara-Gi b͕atara Chineke madu si n'ebo nile ọ bula, na asusu nile ọ bula, na ndi nile ọ bula, na mba nile ọ bula, puta,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile.