Revelation 6:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe m nọ na-elegide ya anya, Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke mbụ dị nꞌakwụkwọ ahụ. Otu nꞌime ihe e kere eke anọ ahụ tiri mkpu dị ka a ga-asị na ọ bụ olu egbe eluigwe dara, gwa m okwu sị m, “Bịa”.
Igbo 2006
M'we hu mb͕e Nwa-aturu ahu saghere otù nime akàrà asa ahu, m'we nu otù nime ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, dika agāsi na o ji olu éb͕è-elu-igwe nēkwu, si, Bia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụrụ m mgbe Nwa atụrụ ahụ meghere otu nʼime akara asaa ahụ. Otu nʼime anụ anọ ahụ dị ndụ tiri mkpu dịka a ga-asị na ọ bụ egbe eluigwe sị, “Bịa!”