Revelation 6:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha nile nọ na-eti oke mkpu na-akpọku Onyenwe anyị na-asị ya, “Gị Onyenwe anyị, Onyenwe ihe nile, Onye dị nsọ na Onye eziokwu, ọ̀ bu ruo ole mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nꞌime ya ikpe nꞌihi ajọ omume ha mesoro anyị? Ọ̀ bụ ruo ole mgbe ka ị na-eche ịbọrọ anyị ọbọ nꞌihi ọbara anyị ndị nile bi nꞌime ụwa wufuru?”
Igbo 2006
ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n'isi ndi bi n'elu uwa?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ji oke olu tie mkpu na-asị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu, ruo olee mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nʼime ya ikpe ma bọọkwa ọbọ nʼisi ha maka ọbara anyị ha wufuru?”