Revelation 6:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu a, mbara eluigwe ahụ nke kpakpando jupụtara adịkwaghị, dị ka a ga-asị na a pịakọtara ya dị ka ute, wepụ ya. Ugwu nta nile na ugwu ukwu nile, na agwa etiti nile makwara jijiji, site nꞌọnọdụ ha wezuga onwe ha.
Igbo 2006
Ewe kewapu elu-igwe dika akwukwọ-odide mb͕e anāpiakọta ya; ewe wepu ugwu nile na agwe-etiti nile ọ bula n'ọnọdu-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mbara eluigwe gabigara, dịka akwụkwọ mgbe a na-apịakọta ya. Ugwu niile na agwa etiti niile ka e wepụkwara site nʼọnọdụ ha.